Luk 6:9-16 Bible Nso (IGBOB)

9. Jisus we si ha, Anamaju unu, Ò ziri ezi n'iwu ime ezi ihe, ma-ọbu ime ihe ọjọ, n'ubọchi-izu-ike? ìzọ̀puta ndu, ma-ọbu ila ya n'iyì?

10. Mb͕e Ọ lesiri ha nile anya gburugburu, O we si ya, Setipu aka-gi. O we me ya: ewe me ka aka-ya di ka ọ di na mbu.

11. Ma ndi ahu juputara n'enweghi-uche; ha we nēkwurita n'etiti onwe-ha ihe ha gēme Jisus.

12. O rue n'ubọchi ndia, na Ọ puru rigo n'ugwu ahu ikpe ekpere; O we nọgide n'ogologo abali ahu nile n'ikpe ekpere nye Chineke.

13. Mb͕e chi bọrọ, Ọ kpọ ndi nēso uzọ-Ya biakute Ya: O we rọputa nime ha madu iri na abua, ndi Ọ kpọ-kwa-ra aha-ha ndi-ozi;

14. Saimon, onye Ọ kpọ-kwa-ra aha-ya Pita, na Andru nwa-nne-ya, na Jemes na Jọn, na Filip na Batọlọmiu,

15. na Matiu na Tomas, na Jemes nwa Alfiọs, na Saimon onye anākpọ Zilotis,

16. na Judas nwa Jemes, na Judas Iskariot, onye ghọrọ onye rara ya nye;

Luk 6