28. nāgọzinu ndi nābu unu ọnu, nēkpe ekpere nye ndi nākpali unu.
29. Onye ọ bula nke nēti gi aka n'otù ǹti, che-kwa-ra ya nke-ọzọ; onye nānapu kwa oké uwe-gi, eb͕ochila ya inara kwa uwe-ime-gi.
30. Nēnye onye ọ bula nāriọ gi; onye nānapu gi ihe-gi, ariọkwala ha n'aka-ya ọzọ.
31. Dika unu nāchọ kwa ka madu mere unu, unu onwe-unu nēme kwa ha otú ahu.
32. Ọ buru kwa na unu ahú ndi ahu n'anya, bú ndi nāhu unu n'anya, àha ekele gini diri unu? n'ihi na ọbuná ndi-nmehie nāhu ndi ahu n'anya, bú ndi nāhu ha n'anya.
33. Ọ buru kwa na unu eme ezi ihe nye ndi nēme ezi ihe nye unu, àha ekele gini diri unu? n'ihi na ọbuná ndi-nmehie nēme otù ihe ahu.
34. Ọ buru kwa na unu ewere ihe binye ha, bú ndi unu nēle anya na unu gānata n'aka-ha, àha ekele gini diri unu? ọbuná ndi-nmehie nēwere ihe binye ndi-nmehie, ka ha we nara kwa nke ra ka ya.