Luk 6:22-33 Bible Nso (IGBOB)

22. Ngọzi nādiri unu, mb͕e ọ bula madu gākpọ unu asì, mb͕e ọ bula ha gēkewapu kwa unu, ta kwa unu uta, tufu kwa aha-unu dika ajọ ihe, n'ihi Nwa nke madu.

23. Ṅurianu ọṅu n'ubọchi ahu, wuli-kwa-nu elu n'ihi ọṅù: n'ihi na le, ugwọ-ọ́lu-unu di uku n'elu-igwe: n'ihi na otú ahu ka ndi bu nna-ha mere ndi-amuma.

24. Ma ahuhu gādiri unu ndi-ọgaranya: n'ihi na unu nēnwezu nkasi-obi-unu.

25. Ahuhu gādiri unu, ndi afọ juworo ub͕u a: n'ihi na agu gāgu unu. Ahuhu gādiri unu, ndi nāchì ọchì ub͕u a: n'ihi na unu gēru újú kwa kwa ákwá.

26. Ahuhu gādiri unu, mb͕e ọ bula madu nile gēkwu okwu ọma bayere unu: n'ihi na otú ahu ka ndi bu nna-ha mere ndi-amuma ugha.

27. Ma asim unu ndi nānu okwum, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēmenu ihe ọma nye ndi nākpọ uṅu asì,

28. nāgọzinu ndi nābu unu ọnu, nēkpe ekpere nye ndi nākpali unu.

29. Onye ọ bula nke nēti gi aka n'otù ǹti, che-kwa-ra ya nke-ọzọ; onye nānapu kwa oké uwe-gi, eb͕ochila ya inara kwa uwe-ime-gi.

30. Nēnye onye ọ bula nāriọ gi; onye nānapu gi ihe-gi, ariọkwala ha n'aka-ya ọzọ.

31. Dika unu nāchọ kwa ka madu mere unu, unu onwe-unu nēme kwa ha otú ahu.

32. Ọ buru kwa na unu ahú ndi ahu n'anya, bú ndi nāhu unu n'anya, àha ekele gini diri unu? n'ihi na ọbuná ndi-nmehie nāhu ndi ahu n'anya, bú ndi nāhu ha n'anya.

33. Ọ buru kwa na unu eme ezi ihe nye ndi nēme ezi ihe nye unu, àha ekele gini diri unu? n'ihi na ọbuná ndi-nmehie nēme otù ihe ahu.

Luk 6