33. Ha we si Ya, Ndi nēso uzọ Jọn nēbu ọnu ọtutu mb͕e, nāriọ kwa aririọ; otú ahu ka ndi nēso uzọ ndi-Farisi nēme kwa; ma ndi nke Gi nēri nāṅu kwa.
34. Ma Jisus siri ha, Ọ̀ gābu na unu puru ime ka umu-ndikom nke ulo anālu nwunye ọhu bue ọnu, mb͕e ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ?
35. Ma ubọchi gābia; mb͕e agānapu kwa ha Onye nālu nwunye ọhu, mb͕e ahu ka ha gēbu ọnu n'ubọchi ahu.
36. O we tu-kwa-ra ha ilu, si, Ọ dighi onye ọ bula nādọkapu iberibe ákwà ọb͕ub͕a n'uwe ọhu tukwasi ya n'uwe ochie; eme otú a, ọ gādọka nke-ọhu, ọzọ kwa, iberibe ákwà ọb͕ub͕a si n'uwe ọhu ahu puta agaghi-adabà na nke-ochie.
37. Ọ dighi kwa onye ọ bula nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie; eme otú a, manya-vine ọhu gāb͕awa karama-akpukpọ, manya onwe-ya gāwusì, karama-akpukpọ ahu gāla kwa n'iyì.
38. Ma aghaghi ib͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu.