12. Jisus we za, si ya, Ekwuwo, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi.
13. Mb͕e ekwensu nwasiri ọnwunwa nile, o we si n'ebe Ọ nọ pua rue mb͕e ọzọ.
14. Jisus we laghachi na Galili n'ike Mọ Nsọ: ùdé-Ya we pua jesa n'ala dum di buruburu.
15. Ya onwe-ya we nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, madu nile nēnye kwa Ya otuto.
16. O we bia rue Nazaret, ebe azuputara Ya, O we ba n'ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike, dika Ọ nēme mb͕e dum, O we bilie igu akwukwọ.
17. Ewe nye Ya akwukwọ Aisaia onye-amuma n'aka. Ó we meghe akwukwọ ahu, chọta ebe edeworo ya, si,
18. Mọ nke Onye-nwe-ayi di n'arum.N'ihi na O terem manu izì ndi-ob͕enye ozi ọma:O ziteworom ikwusa ọrira gwa ndi adọtara n'agha,Na ikwusa ihu-uzọ gwa ndi-ìsi,Izipu ndi etihiawara aru ka ha la,
19. Ikwusa arọ mb͕e Onye-nwe-ayi nānara madu nke-ọma.
20. O we kpuchie akwukwọ ahu, were ya nyeghachi onye nējere ha ozi, we nọdu ala: ndi nile nọ n'ulo-nzukọ ahu we nēlegide Ya anya.
21. O we malite isi ha, Ta ka emezuworo ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ na nti-unu.
22. Ha nile we buru ndi-àmà-Ya, okwu nile nke amara nke si n'ọnu-Ya puta nēju kwa ha nile anya: ha we si, Onye a, Ọ̀ bughi Nwa Josef?
23. O we si ha, N'ezie unu gaturu m ilu a, Dibia, me ka aru Gi onwe-gi di ike: ka ihe ayi nuru na emere ha na Kapanaum ra, me kwa otú a n'ebe a n'obodo nke aka Gi.
24. O we si, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye-amuma ọ bula nke anara nke-ọma n'obodo nke aka ya.