9. Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi kwa anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile; ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku.
10. Ìgwè madu ahu we jua ya, si, Ọ̀ bu kwa gini kwesiri ka ayi me?
11. O we za, si ha, Onye nwere uwe-ime abua, ya me onye nēnweghi ka o keta; onye nwekwara nri, ya mee otú ahu.
12. Ndi-ọna-utu biakwara ka eme ha baptism, ha we si ya, Onye-ozizí, gini kwesiri ka ayi me?
13. Ọ si ha, Unu apunarala madu kari ihe akaworo unu.
14. Ndi-agha nēje ozi jukwara ya, si, Ayi onwe-ayi kwa, gini kwesiri ka ayi me? Ọ si ha, Unu ejidela onye ọ bula aka ike, ebokwala onye ọ bula ebubo ugha; ka afọ ju kwa unu n'ego-ọlu-unu.