10. Ìgwè madu ahu we jua ya, si, Ọ̀ bu kwa gini kwesiri ka ayi me?
11. O we za, si ha, Onye nwere uwe-ime abua, ya me onye nēnweghi ka o keta; onye nwekwara nri, ya mee otú ahu.
12. Ndi-ọna-utu biakwara ka eme ha baptism, ha we si ya, Onye-ozizí, gini kwesiri ka ayi me?
13. Ọ si ha, Unu apunarala madu kari ihe akaworo unu.
14. Ndi-agha nēje ozi jukwara ya, si, Ayi onwe-ayi kwa, gini kwesiri ka ayi me? Ọ si ha, Unu ejidela onye ọ bula aka ike, ebokwala onye ọ bula ebubo ugha; ka afọ ju kwa unu n'ego-ọlu-unu.
15. Mb͕e ndi-Ju nọ nēle anya, mb͕e madu nile nātughari kwa n'obi-ha ihe bayere Jọn, ma eleghi anya ya onwe-ya bu Kraist ahu,
16. Jọn zara, si ha nile, Mu onwem nēji miri me unu baptism n'ezie; ma Onye kam ike nābia, Onye m'nērughi itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism:
17. Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, ifuchapu ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, na ikpokọta ọka-Ya n'ọba-Ya; ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o.
18. Ya mere o ji ọtutu ndumọdu di iche iche zì ndi-Ju ozi ọma;
19. ma Herod, bú tetrarch, ebe Jọn turu ya nmehie-ya n'anya, bú ihe bayere Herodias nwunye nwa-nna-ya, na ihe bayere ajọ ihe nile Herod mere,
20. ọ tukwasi-kwara nka n'elu ihe nile, na o mechibidoro Jọn n'ulo-nkpọrọ.