Luk 3:1-2 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma n'arọ nke-iri-na-ise n'ọchichi nke Taibiriọs Sisa, mb͕e Pọntiọs Pailat bu onye nāchi Judia, mb͕e Herod bu kwa tetrarch nke Galili, mb͕e nwa-nne-ya Filip bu kwa tetrarch nke ala Ituria na Trakonaitis, mb͕e Lisanias bu kwa tetrarch nke Abilini,

2. mb͕e Anas na Kaiafas bu ndi-isi-nchu-àjà, okwu Chineke biakutere Jọn nwa Zakaraias n'ọhia.

Luk 3