32. Ha we sirita onwe-ha, Òbi-ayi ekpoghi ọku nime ayi, mb͕e Ọ nāgwa ayi okwu n'uzọ, mb͕e Ọ nēmeghere ayi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ?
33. Ha we bilie n'oge hour ahu, laghachi na Jerusalem, we hu ndi-ozi iri na otù ahu, na ndi ha na ha nọ, ka ha zukọrọ,
34. nāsi, N'ezi-okwu Onye-nwe-ayi esiwo n'ọnwu bilie, were kwa Onwe-ya gosi Saimon.
35. Ha onwe-ha we kọ ihe mere n'uzọ, na otú ha mara Ya n'inyawa ob͕e achicha ahu.
36. Ma mb͕e ha nēkwu ihe ndia, Ya onwe-ya guzoro n'etiti ha, si ha, Udo diri uno.