Luk 24:24-32 Bible Nso (IGBOB)

24. Ufọdu n'etiti ndi soro ayi we je ílì ahu, hu kwa ya ọbuná otú ndinyom ahu kwuru: ma Ya onwe-ya ka ha nāhughi.

25. Ya onwe-ya we si ha, Unu ndi nēnweghi uche, ndi di kwa urè n'obi ikwere n'ihe nile ndi-amuma kwuru!

26. Ọ̀ bughi na Kraist aghaghi ihu ahuhu ndia, na ibà n'ebube-Ya?

27. O we malite isi n'akwukwọ Moses, si kwa n'akwukwọ ndi-amuma nile, me ka ha mata isi okwu bayere Onwe-ya n'ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ.

28. Ha we biarue obodo ntà ahu nso, ebe ha nāga: ma Ya onwe-ya mere dika Ọ nāga n'iru.

29. Ha we rugide Ya, si, Nọyere ayi: n'ihi na o rubewo anyasi, ubọchi agamiwo kwa ub͕u a. O we ba n'ulo inọyere ha.

30. O we rue, mb͕e Ya na ha nọdusiri na nri, na O were ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya, we nēnye ha.

31. Ewe saghe anya-ha, ha we mara Ya; Ya onwe-ya we funari n'anya-ha.

32. Ha we sirita onwe-ha, Òbi-ayi ekpoghi ọku nime ayi, mb͕e Ọ nāgwa ayi okwu n'uzọ, mb͕e Ọ nēmeghere ayi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ?

Luk 24