13. Ma le, ubọchi ahu ndikom abua nime ha nāga otù obodo ntà, aha-ya bu Emeus, nke di ọgu mail atọ site na Jerusalem.
14. Ndi ahu nākparita kwa n'etiti onwe-ha uka bayere ihe ndia nile mereri.
15. O we rue, mb͕e ha nākparita uka nājurita kwa onwe-ha ajuju, Jisus onwe-ya we biarue nso, so kwa ha ga.
16. Ma eb͕ochiri ha anya ka ha ghara ima Ya.