Luk 24:11-19 Bible Nso (IGBOB)

11. Okwu ndia we di ka okwu efu n'anya-ha; ha ekweghi kwa ha.

12. Ma Pita biliri, b͕a ọsọ jerue ílì; o we ruru ala, nyo nime ya, we hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ nání ha; o we la n'ulo-ya, ihe nke meworo nēju kwa ya anya.

13. Ma le, ubọchi ahu ndikom abua nime ha nāga otù obodo ntà, aha-ya bu Emeus, nke di ọgu mail atọ site na Jerusalem.

14. Ndi ahu nākparita kwa n'etiti onwe-ha uka bayere ihe ndia nile mereri.

15. O we rue, mb͕e ha nākparita uka nājurita kwa onwe-ha ajuju, Jisus onwe-ya we biarue nso, so kwa ha ga.

16. Ma eb͕ochiri ha anya ka ha ghara ima Ya.

17. O we si ha, Gini bu okwu ndia unu nāgwarita onwe-unu, ka unu nāga ije? Ha we guzo nāb͕aru iru.

18. Otù onye nime ha, aha-ya bu Kleopas, we za, si Ya, Ọ̀ bu nání Gi onwe-gi nọ dika ọbìa na Jerusalem nāmaghi ihe mere nime ya n'ubọchi ndia?

19. Ọ si ha, Ihe gini? Ha si Ya, Ihe bayere Jisus Onye Nazaret, Onye bu onye-amuma di ike n'ọlu na okwu n'iru Chineke na ndi-Ju nile:

Luk 24