Luk 23:6-12 Bible Nso (IGBOB)

6. Ma mb͕e Pailat nuru ya, ọ jua ma Nwoke a bu onye Galili.

7. Mb͕e ọ mazuru na O si n'ebe Herod nāchi bia, o we ziga Ya jekuru Herod, onye ya onwe-ya nọ kwa na Jerusalem na mb͕e ahu.

8. Ma mb͕e Herod huru Jisus, Ọ ṅuria ọṅu nke-uku: n'ihi na ọ nāchọ ihu Ya anya n'oge di anya gara aga, n'ihi na ọ nuru ihe bayere Ya; o we nēle anya ihu ihe-iriba-ama di aṅa Ọ gēme.

9. O we jua Ya ajuju n'ọtutu okwu; ma Ya onwe-ya azaghi ya ihe ọ bula.

10. Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we guzo, nēbo Ya ebubo si-ike.

11. Herod, ya na ndi-agha-ya, we me Ya ka Ọ buru ihe-efu, o me-kwa-ra Ya ihe-ọchì, we b͕okwasi Ya uwe mara nma nke-uku we zighachi Ya jekuru Pailat.

12. Herod na Pailat we me eyì n'etiti onwe-ha n'ubọchi ahu: n'ihi na n'oge gara aga ha bu ndi-iro.

Luk 23