5. Mb͕e ufọdu nēkwu okwu bayere ulo uku Chineke, na ewereri nkume ọma na ihe enyere Chineke dozie ya, O we si,
6. Ihe ndia nke unu nēkiri, ubọchi gābia, nke anāgaghi-arapu otù nkume n'ebe a n'elu nkume-ibe-ya, nke anāgaghi-akwatu n'ala.
7. Ha we jua Ya, si, Onye-ozizí, òle mb͕e ihe ndia gābu kwa? gini gābu kwa ihe-iriba-ama mb͕e ọ bula ihe ndia gaje ime?
8. O we si, Lezienu anya ka aghara iduhie unu; n'ihi na ọtutu madu gābia n'aham, si, Mu onwem bu Ya; na, Oge ahu di nso: unu esola ha n'azu.
9. Ma mb͕e ọ bula unu gānu okwu agha di iche iche na aghara di iche iche, unu atula ujọ: n'ihi na ihe ndia aghaghi ibu uzọ puta; ma ọgwugwu ihe nile adighi-eru ngwa ngwa.
10. Mb͕e ahu Ọ siri ha, Mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ:
11. oké ala-ọma-jijiji gādi kwa, oké unwu na ajọ ọria nēfe efe gādi kwa n'ebe di iche iche; ihe di egwu na ihe-iriba-ama uku gādi kwa site n'elu-igwe.
12. Ma mb͕e ihe ndia nile akēmeghi, ha gātukwasi unu aka-ha, sob͕u kwa unu, nārara unu nye n'aka ulo-nzukọ na ulo-nkpọrọ, n'ebe anēduputa unu ga n'iru ndi-eze na ndi-isi n'ihi aham.
13. Ọ gāghọrọ unu àmà.
14. Ya mere, zubenu n'obi-unu, na unu agaghi-ebu uzọ tughari uche otú unu gāgọpu onwe-unu:
15. n'ihi na Mu onwem gēnye unu ọnu na amam-ihe, nke ndi nile nēmegide unu nāgaghi-apu iguzogide ma-ọbu ikwugide okwu.
16. Ma ọbuná ndi muru unu, na umu-nne-unu, na ndi-ikwu-unu, na ndi-eyì-unu, gārara unu nye; ha gēme kwa ka ufọdu nime unu nwua ọnwu.
17. Madu nile gakpọ kwa unu asì n'ihi aham.
18. Ma otù agiri-isi agaghi-esi n'isi-unu la n'iyì ma-ọli.
19. Na ntachi-obi-unu unu gānata nkpuru-obi-unu.
20. Ma mb͕e ọ bula unu gāhu Jerusalem ka achi usu-ndi-agha nọgide ya gburugburu, mb͕e ahu maranu na itọb͕ọrọ-n'efu-ya di nso.