Luk 21:32-37 Bible Nso (IGBOB)

32. N'ezie asim unu, Ọbọ a agaghi-agabiga ma-ọli, rue mb͕e ihe nile gēme.

33. Elu-igwe na uwa gāgabiga: ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.

34. Ma nēzenu onwe-unu, ka aghara iwere imebiga-ajọ-ihe-ókè, na iṅubiga-manya-ókè, na ncheb͕u nke ndu a, bob͕u obi-unu ma eleghi anya, ubọchi ahu we biakwasi unu na mberede dika ọnyà;

35. n'ihi na otù a ka ọ gābiakwasi ndi nile bi n'elu uwa nile.

36. Ma murunu anya n'oge ọ bula, nāriọ aririọ, ka unu we nwe ike ib͕anari ihe nile ndia nke gaje ime, na iguzo n'iru Nwa nke madu.

37. Kwa-ubọchi O nēzí ihe n'ulo uku Chineke; kwa-abali Ọ nāpu, nānọ ọnọdu-abali n'ugwu anākpọ ugwu Olive.

Luk 21