Luk 21:22-30 Bible Nso (IGBOB)

22. N'ihi na ndia bu ubọchi nkpeputa, ka ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu.

23. Ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu; n'ihi na oké nkpà gādi n'ala nka, iwe gādi-kwa-ra ndi-Ju.

24. Ha gāda kwa site n'ọnu mma-agha, agādọta kwa ha n'agha ga na mba nile: ndi mba ọzọ gāzọda Jerusalem n'ala, rue mb͕e oge nke mba ọzọ gēmezu.

25. Ihe-iriba-ama di iche iche gādi kwa n'anyanwu na ọnwa na kpakpando; n'elu uwa ka nkpab͕u nke mba di iche iche gādi kwa, ndi nọ n'obi abua n'ihi nbib͕o nke oké osimiri na ebili-miri;

26. madu nātub͕ọ site n'egwu, site kwa na ile-anya ihe nābiakwasi n'elu-uwa dum madu bi: n'ihi na agēme ka ike nile nke elu-igwe me nkpatu.

27. Mb͕e ahu ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n'igwe-oji, Ya na ike na oké ebube.

28. Ma mb͕e ihe ndia malitere ime, lenu anya n'elu, welikwanu isi-unu; n'ihi na nb͕aputa-unu nēru nso.

29. O we turu ha ilu: Lenu osisi fig, na osisi nile:

30. mb͕e ọ bula ha púru epú ub͕u a, unu huru ya mara kwa n'onwe-unu na mb͕e okpom-ọku di nso ub͕u a.

Luk 21