17. Madu nile gakpọ kwa unu asì n'ihi aham.
18. Ma otù agiri-isi agaghi-esi n'isi-unu la n'iyì ma-ọli.
19. Na ntachi-obi-unu unu gānata nkpuru-obi-unu.
20. Ma mb͕e ọ bula unu gāhu Jerusalem ka achi usu-ndi-agha nọgide ya gburugburu, mb͕e ahu maranu na itọb͕ọrọ-n'efu-ya di nso.
21. Mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu; ndi nọ kwa n'etiti ya, ka ha si nime ya wezuga onwe-ha; ndi nọ kwa n'ala ọzọ, ka ha ghara ibà nime ya.