Luk 20:39-47 Bible Nso (IGBOB)

39. Ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ we za, si, Onye-ozizí, I kwuru nke-ọma.

40. N'ihi na ha enweghi anya-ike ọzọ iju Ya ajuju ọ bula.

41. O we si ha, Hà si aṅa kwu na Kraist ahu bu nwa Devid?

42. N'ihi na Devid onwe-ya nēkwu n'akwukwọ Abù ọma, si,Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem,Nọdu ala n'aka-nrim,

43. Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Gi abua.

44. Ya mere, Devid nākpọ Ya Onye-nwe-ya, Ò si kwa aṅa buru Nwa-ya?

45. Ma mb͕e ndi-Ju nile nānu okwu-Ya Ọ si ndi nēso uzọ-Ya,

46. Nēzenu ndi-ode-akwukwọ, ndi nāchọ ijeghari n'uwe-nwuda, ndi nāhu kwa ekele n'ọma-ahia nile unu n'anya, na isi oche nile n'ulo-nzukọ nile unu, na isi ọnọdu n'oriri nile unu;

47. ndi nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru, ndi nēkpe kwa ogologo ekpere ka madu we hu ha anya: ndia gēnwe ezi ọmuma-ikpé gabigara ókè kari ndi ọzọ.

Luk 20