Luk 20:1-18 Bible Nso (IGBOB)

1. O we rue, n'otù nime ubọchi ahu, mb͕e Ọ nēzí ndi-Ju ihe n'ulo uku Chineke, nēzì kwa ozi ọma, na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ, ha na ndi-okenye, we guzo Ya nso;

2. ha we kwue, si Ya, Gwa ayi: Ọ̀ bu n'aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ma-ọbu ònye ka ọ bu, bú onye nyere Gi ike a?

3. Ma Ọ zara, si ha, Mu onwem gāju kwa unu otù ajuju unu zakwam:

4. Baptism nke Jọn, ò sitere n'elu-igwe, ma-ọbu na o sitere n'aka madu?

5. Ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ buru na ayi asi, O sitere n'elu-igwe; Ọ gāsi, N'ìhi gini ka unu nējighi kwe ya?

6. Ma ọ buru na ayi asi, O sitere n'aka madu; ndi-Ju nile gēji nkume tub͕u ayi: n'ihi na emewo ka ha kweye na Jọn bu onye-amuma.

7. Ha we za, si na ha amataghi ebe o sitere.

8. Jisus we si ha, Mu onwem agaghi-agwa kwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia.

9. O we malite ituru ndi-Ju ilu a: Otù onye kuru ubi-vini, were kwa ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ nọdu oge di anya.

10. N'oge ighọ nkpuru o we zigara ndi-ọlu-ubi ahu otù orù, ka ha we nye ya nkpuru ufọdu nke ubi-vine ahu: ma ndi-ọlu-ubi ahu piara ya ihe, zilaga ya n'aka efu.

11. O we zikwasi orù ọzọ: ha we pia kwa ya ihe, me ya ihe-ihere, zilaga ya n'aka efu.

12. O we zikwasi orù nke-atọ: ha we meru kwa onye ahu aru, we tupu ya.

13. Onye-nwe ubi-vine ahu we si, Gini ka m'gēme? m'gēziga ọkparam m'huru n'anya: eleghi anya ha gāsọpuru nwam nka.

14. Ma mb͕e ndi-ọlu-ubi ahu huru ya, ha kwurita n'etiti onwe-ha, si, Nka bu onye-nketa: ka ayi b͕ue ya, ka ihe-nketa-ya we buru nke ayi.

15. Ha we tupu ya n'azu ubi-vine ahu, b͕ue ya. Gini kwa ka onye-nwe ubi-vine ahu gēme ha?

16. Ọ gābia, la ndi-ọlu-ubi ahu n'iyì, were kwa ubi-vine ahu nye ndi ọzọ. Ma mb͕e ha nuru ya, ha si, Chineke ekwela.

17. Ma O lere ha anya, si, Gini kwa bu ihe a nke edeworo n'akwukwọ nsọ,Nkume nke ndi nēwu ulo juru,Nke ahu ka emere isi nkuku ulo?

18. Agētiwasi onye ọ bula nke dakwasiri nkume ahu; ma onye ọ bula ọ gādakwasi ya, ọ gēfesa ya ka uzuzu.

Luk 20