25. Ma le, otù nwoke nọ na Jerusalem, onye aha-ya bu Simeon; nwoke a bu kwa onye ezi omume na onye nātu egwu Chineke, nēche nkasi-obi nke Israel: Mọ Nsọ di kwa n'aru ya.
26. Mọ Nsọ duru ya-ri ọdu, na ọ gaghi-ahu ọnwu, rue mb͕e ọ gāhu Kraist nke Onye-nwe-ayi.
27. O we bia na Mọ ahu nime ulo uku Chineke: mb͕e ndi muru Ya kubatara Nwatakiri ahu, bú Jisus, ka ha we mere Ya dika omume iwu Chineke si di,
28. ya onwe-ya we nara Ya nke-ọma, kuru Ya n'aka-ya, gọzi kwa Chineke, si,
29. Onye-nwem, ub͕u a ka I gārapu orù-Gi ka ọ laN'udo, dika okwu-Gi si di;
30. N'ihi na anyam ahuwo nzọputa-Gi,
31. Nke I doziri n'iru ndi nile;
32. Ìhè agēkpughere mba nile ọzọ,Na ebube ndi-Gi, bú Israel.