Luk 2:23-36 Bible Nso (IGBOB)

23. (dika edeworo ya n'iwu Onye-nwe-ayi, Nwa mbu ọ bula nke bu oke nke meghere àkpà-nwa, agākpọ ya ihe nsọ nye Onye-nwe-ayi),

24. na inye ihe-ichu-àjà dika okwu ekwuworo n'iwu Onye-nwe-ayi si di, Nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua.

25. Ma le, otù nwoke nọ na Jerusalem, onye aha-ya bu Simeon; nwoke a bu kwa onye ezi omume na onye nātu egwu Chineke, nēche nkasi-obi nke Israel: Mọ Nsọ di kwa n'aru ya.

26. Mọ Nsọ duru ya-ri ọdu, na ọ gaghi-ahu ọnwu, rue mb͕e ọ gāhu Kraist nke Onye-nwe-ayi.

27. O we bia na Mọ ahu nime ulo uku Chineke: mb͕e ndi muru Ya kubatara Nwatakiri ahu, bú Jisus, ka ha we mere Ya dika omume iwu Chineke si di,

28. ya onwe-ya we nara Ya nke-ọma, kuru Ya n'aka-ya, gọzi kwa Chineke, si,

29. Onye-nwem, ub͕u a ka I gārapu orù-Gi ka ọ laN'udo, dika okwu-Gi si di;

30. N'ihi na anyam ahuwo nzọputa-Gi,

31. Nke I doziri n'iru ndi nile;

32. Ìhè agēkpughere mba nile ọzọ,Na ebube ndi-Gi, bú Israel.

33. Ihe ekwuru bayere Ya we nēju kwa nna-Ya na nne-Ya anya;

34. Simeon we gọzie ha, si kwa Meri nne-Ya, Le, edowo Nwa nka ka Ọ buru ọdida na nbili nke ọtutu madu n'Israel; ka Ọ buru kwa ihe-iriba-ama anēkwu okwu megide;

35. ma mma-agha gāduwa kwa nkpuru-obi gi onwe-gi; ka ewe kpughe èchìchè nke si n'ọtutu obi puta.

36. Otù onye anākpọ Ana di kwa, bú onye-amuma-nwanyi, nwa-nwanyi Fanuel, nke si n'ebo Asha puta (nwanyi a aghọwo ezi agadi, ebe ya na di-ya biri arọ asa site na nwa-ab͕ọghọ-ya,

Luk 2