Luk 2:15-27 Bible Nso (IGBOB)

15. O we rue, mb͕e ndi-mọ-ozi puru n'ebe ha nọ la n'elu-igwe, ndi-ọzùzù-aturu we sirita onwe-ha, Ka ayi je rue Betlehem ub͕u a, hu ihe a ekwuru, nke Onye-nwe-ayi mere ka ayi mara.

16. Ha we were ọsọ bia, hu Meri na Josef, na Nwa ọhu ahu ka O dinara n'ihe ahu anētiye nri anu-ulo.

17. Ma mb͕e ha huru ya, ha me ka amara okwu agwara ha-ri bayere Nwatakiri ahu.

18. Okwu ndi-ọzùzù-aturu gwara ha we ju ndi nile nuru ha anya.

19. Ma Meri debere ihe ndia nile ekwuru, nātughari ha n'obi-ya.

20. Ndi-ọzùzù-aturu we laghachi, nēnye Chineke otuto, nēto kwa Ya n'ihi ihe nile ha nuru na nke ha huru, dika agwara ha.

21. Mb͕e ubọchi asatọ zuru ibì Ya úgwù, ewe kpọ aha-Ya Jisus, nke mọ-ozi kpọrọ ya mb͕e akātughi ime Ya.

22. Mb͕e ubọchi nile nke ime ha ka ha di ọcha dika iwu nke Moses si di zuru, ha we kuru Ya rigoro Jerusalem, iche Ya n'iru Onye-nwe-ayi

23. (dika edeworo ya n'iwu Onye-nwe-ayi, Nwa mbu ọ bula nke bu oke nke meghere àkpà-nwa, agākpọ ya ihe nsọ nye Onye-nwe-ayi),

24. na inye ihe-ichu-àjà dika okwu ekwuworo n'iwu Onye-nwe-ayi si di, Nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua.

25. Ma le, otù nwoke nọ na Jerusalem, onye aha-ya bu Simeon; nwoke a bu kwa onye ezi omume na onye nātu egwu Chineke, nēche nkasi-obi nke Israel: Mọ Nsọ di kwa n'aru ya.

26. Mọ Nsọ duru ya-ri ọdu, na ọ gaghi-ahu ọnwu, rue mb͕e ọ gāhu Kraist nke Onye-nwe-ayi.

27. O we bia na Mọ ahu nime ulo uku Chineke: mb͕e ndi muru Ya kubatara Nwatakiri ahu, bú Jisus, ka ha we mere Ya dika omume iwu Chineke si di,

Luk 2