Luk 19:7-15 Bible Nso (IGBOB)

7. Mb͕e ha huru ya, ha nile we nātamu, si, Ọ bàra inọ ọnọdu-abali n'ulo nwoke bu onye-nmehie.

8. Zakiọs we guzọ, si Onye-nwe-ayi, Le, Onye-nwe-ayi, nkera ihe m'nwere ka m'gēnye ndi-ob͕eye; ọ buru kwa na anaram onye ọ bula ihe site n'ebubo ugha, m'gēnyeghachi anọ anọ.

9. Jisus we si ya, Ta ka nzọputa biaruru ulo a, ebe ya onwe-ya bu kwa nwa Abraham.

10. N'ihi na Nwa nke madu biara ichọ na izọputa ihe nke furu efu.

11. Ma mb͕e ha nānu ihe ndia, Ọ tukwasi tu ilu, n'ihi na Ọ nọ Jerusalem nso, na n'ihi na ha nēchè na ala-eze Chineke gaje iputa ìhè ngwa ngwa.

12. Ya mere Ọ siri, Otù nwoke amazuru aha-ya gara ala di anya, inara ala-eze nye onwe-ya, na ilaghachi.

13. O we kpọ madu iri nime ndi-orù-ya, nye ha ọgu pound abua na iri, si ha, Zuanu ahia rue mb͕e m'gābia.

14. Ma ndi-obodo-ya kpọrọ ya asì, ha we zìe ndi-ozi ga n'azu ya, si, Ayi achọghi ka nwoke a buru eze-ayi.

15. O we rue, mb͕e ọ laghachiri ọzọ, mb͕e ọ natasiri ala-eze-ya, na ọ siri ka akpọ ndi-orù ahu, ndi ọ nyereri ego ahu, ka ha biakute ya, ka o we mara ihe ha zutarari n'ahia.

Luk 19