Luk 19:23-26 Bible Nso (IGBOB)

23. n'ihi gini kwa ka i nējighi were egom nye ndi nāb͕anwe ego, mu onwem gānara kwa ya na uma mb͕e m'biara?

24. O we si ndi guzoro nso, Napunu ya pound ise ahu, were ha nye onye nwere ọgu pound abua na iri ahu.

25. Ha we si ya, Onye-nwe-ayi, o nwere ọgu pound abua na iri.

26. Asim unu, na onye ọ bula nke nwere ka agēnye; ma onye nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.

Luk 19