8. Asim unu, na Ọ gēkpeputa ha ọsọsọ. Otú ọ di, mb͕e Nwa nke madu gābia, Ọ̀ gāhu okwukwe n'elu uwa?
9. O we tu kwa ilu a nye ufọdu ndi tukwasiri obi n'onwe-ha na ha bu ndi ezi omume, ndi kpọkwara ndi nile fọduru ihe-efu:
10. Ndikom abua rigoro n'ulo uku Chineke ikpe ekpere; otù nime ha bu onye-Farisi, ibe-ya bu onye-ọna-utu.
11. Onye-Farisi guzoro nēkpe ekpere nye onwe-ya otú a, si, Chineke, ekelem Gi, na adighi m ka ndi fọduru n'etiti madu, ndi nāpunara madu ihe, ndi ajọ omume, ndi nākwa iko, ma-ọbu dika ọbuná onye-ọna-utu a.
12. Anamebu ọnu ub͕ò abua n'ízù ubọchi asa; anamenye otù uzọ n'uzọ iri n'ihe nile, ka ha ra, bú nke m'natara.
13. Ma onye-ọna-utu ahu guzoro n'ebe di anya, ọ chọghi kwa iweli ọbuná anya-ya le elu-igwe, kama ọ nēti aka n'obi-ya, si, Chineke, ka obi-Gi juru n'ebe mu, bú onye-nmehie, nọ.
14. Asim unu, Nwoke a ridara n'ulo-ya buru onye aguworo n'onye ezi omume kari ibe-ya: n'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ma onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.
15. Ha we kutakwara Ya umu ọhu ha, ka O we metu ha aka: ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru ya, ha bara ha nba.
16. Ma Jisus kpọrọ ha biakute Ya, si, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem, unu eb͕ochi-kwa-la ha: n'ihi na ala-eze Chineke bu nke ndi di otú a.
17. N'ezie asim unu, Onye ọ bula nke nāgaghi-anara ala-eze Chineke dika nwatakiri, ọ gaghi-abà nime ya ma-ọli.
18. Otù onye-isi we jua Ya, si, Ezi Onye-ozizí, gini ka m'gēme ka m'we keta ndu ebighi-ebi?
19. Ma Jisus siri ya, Gini mere i nākpọm ezi onye? ọ dighi onye ọ bula bu ezi onye, ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke.
20. I matawo ihe nile enyere n'iwu, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Sọpuru nna-gi na nne-gi.
21. Ma ọ siri, Ihe ndia nile ka m'ribara ama site n'okorọbia.
22. Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si ya, Otù ihe fọdu-kwa-ra gi ime: re ihe nile, ka ha ra, bú nke i nwere, kenye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som.
23. Ma mb͕e ọ nuru ihe ndia, o wutara ya nke-uku; n'ihi na ọ bu oké ọgaranya.
24. Ma ebe Jisus huru ya, Ọ si, Le otú ọ diri ndi nwere àkù ike ibà n'ala-eze Chineke!
25. N'ihi na ọ dikariri kamel nfé isite n'anya àgìgá ba nime, kari ọgaranya ibà n'ala-eze Chineke.