5. Mb͕e ọ chọputaworo ya, we tukwasi ya n'ùbú-ya abua, nāṅuri.
6. Mb͕e ọ biaworo n'ulo, o we kpọkọta ndi-eyì-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya, si ha, Sonum ṅuri ọṅu, n'ihi na achọputawom aturum furu efu.
7. Asim unu, na otú a ọṅu gādi n'elu-igwe n'isi otù onye-nmehie nke nēchèghari, kari n'isi ọgu ndi ezi omume anọ na iri na iteghete, ndi nchèghari nādighi nkpà.
8. Ma-ọbu òle nwanyi nke nwere shilling iri, ọ buru na otù shilling efunari ya, nāmuyeghi oriọna, za ulo-ya, chọsi ike rue mb͕e ọ gāchọputa ya?
9. Mb͕e ọ chọputaworo ya, o we kpọkọta ndi-eyì-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya, si, Sonum ṅuri ọṅu, n'ihi na achọputawom shilling nke funariworom-ri.
10. Asim unu, na otù a ọṅù di n'iru ndi-mọ-ozi Chineke n'isi otù onye-nmehie nke nēchèghari.
11. O we si, Otù nwoke ji umu-ndikom abua:
12. nke bu nwata nime ha we si nna-ya, Nna, nyem òkè nke ihe i nwere nke rurum. O we kewara ha ihe nile o ji biri.
13. Mb͕e ọtutu ubọchi agabigaghi nwa-ya nke-nwata ahu we kporo ihe nile, je ala ọzọ di anya; n'ebe ahu ka o mefuru ihe o nwere n'idi ndu nke ila-n'iyì.