1. O rue, mb͕e Ọ batara n'ulo otù onye nime ndi-isi nke ndi-Farisi iri nri n'ubọchi-izu-ike, na ndi ahu nēche Ya nche.
2. Ma le, otù nwoke nọ n'iru Ya nke nwere ọria aru-miri.
3. Jisus we za, gwa ndi-iwu na ndi-Farisi okwu, si, Ò ziri ezi n'iwu ime ka aru madu di ike n'ubọchi-izu-ike, ma-ọbu na o zighi ezi?
4. Ma ha kpuchiri ọnu. O we jide ya aka, me ka aru di ya ike, we rapu ya ka ọ la.
5. O we si ha, Ọ̀ bu nwa-nwoke ma-ọbu ehi nke onye n'etiti unu gādabà n'olùlù-miri, ma onye ahu agaghi-adọkpulite ya elu ngwa ngwa n'ubọchi-izu-ike?
6. Ma ha enweghi ike iza okwu ndia ọzọ.
7. O we turu ndi akpọrọ ilu, mb͕e Ọ ribara ama otú ha nārọrọ isi ọnọdu; nāsi ha,
8. Mb͕e ọ bula madu gākpọ gi n'oriri ọlulu-nwunye, anọdula n'isi ọnọdu; ma eleghi anya ọ kpọwori otù onye ka gi na nsọpuru,
9. onye kpọrọ gi na ya we bia si gi, Nye nwoke a ọnọdu; mb͕e ahu i gāmalite iji ihere were ọnọdu ikpe-azu.
10. Ma mb͕e ọ bula agākpọ gi, ga nọdu n'ọnọdu ikpe-azu; ka, mb͕e onye kpọworo gi gābia, ka o we si gi, Eyìm, rigo n'ọnọdu ka elu: mb͕e ahu i gēnwe otuto n'iru ndi nile gi na ha nānọdu na nri.
11. N'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ọzọ, onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.
12. O we si kwa onye kpọrọ Ya-ri, Mb͕e ọ bula i siri nri-ututu ma-ọbu nri-anyasi, akpọla ndi-eyì-gi, ma-ọbu umu-nne-gi, ma-ọbu ndi-ikwu-gi, ma-ọbu ndi-ab͕ata-obi-gi, bú ndi ọgaranya; ka ha onwe-ha we ghara ikpọghachi kwa gi ma eleghi anya, ewe nyeghachi gi ihe.
13. Kama mb͕e ọ bula i siri nri uku, kpọ ndi-ob͕eye, ndi-ọlusi, ndi-ngwurọ, ndi-ìsì: