Luk 13:13-33 Bible Nso (IGBOB)

13. O we tukwasi nwanyi ahu aka-Ya abua: ngwa ngwa ewe me ka o guzozie ọtọ, o we nye Chineke otuto.

14. Ma onye-isi ulo-nzukọ ahu, ebe iwe were ya nke-uku n'ihi na Jisus mere ka aru madu di ike n'ubọchi-izu-ike, ọ zara, si ìgwè madu ahu, Ubọchi isi di nke madu aghaghi ilu ọlu nime ha: ya mere, bianu nime ha ka eme ka aru-unu di ike, unu abiakwala n'ubọchi-izu-ike.

15. Ma Onye-nwe-ayi zara ya, si, Ndi-iru-abua; onye ọ bula nime unu, ọ̀ dighi-atọpu ehi-ya ma-ọbu inyinya-ibu-ya n'ulo anu-ulo n'ubọchi-izu-ike, duru ya ga ime ka ọ ṅua miri?

16. Ma nwanyi a, ebe ọ bu nwa Abraham, onye Setan kere ab͕u, le, arọ iri na asatọ, ò kwesighi ka atọpu ya n'ab͕ú a n'ubọchi-izu-ike?

17. Mb͕e Ọ nēkwu ihe ndia, ewe me ka ihere me ndi nile nēmegide Ya: ìgwè madu ahu nile nāṅuri kwa ọṅu n'ihi ihe-ebube nile Ọ nēme.

18. Ya mere O kwuru, si, Gini ka ala-eze Chineke yiri? gini ka M'gēji kwa tunyere ya?

19. O yiri nkpuru mustard, nke madu were, tubà n'ubi nke aka ya ab͕ara ogige; o we ba uba, ghọ osisi; anu-ufe nke elu-igwe we nọ n'alaka-ya.

20. Ọzọ kwa Ọ siri, Gini ka M'gēji tuyere ala-eze Chineke?

21. O yiri ihe nēko achicha, nke nwanyi were, zobe na mb͕é utu ọka atọ, rue mb͕e utu ọka ahu dum kosiri.

22. O we nāga n'obodo na obodo ntà di iche iche, nēzí ihe, nāga kwa ije-Ya iru Jerusalem.

23. Otù onye we si Ya, Onye-nwe-ayi, Ǹdi anāzọputa di madu ole-na-ole? O we si ha,

24. Jisienu ike isi n'ọnu-uzọ di warara ba: n'ihi na ọtutu madu, ka M'si unu, gāchọ ibà nime ya, ma ha agaghi-enwe ike.

25. Mb͕e Nna-nwe-ulo gēbiliwori, mechi kwa uzọ-Ya, unu we malite iguzo n'èzí, na iku aka n'ọnu-uzọ ahu, si Onye-nwe-ayi, meghere ayi uzọ; ma Ọ gāza, si unu, Amataghim unu, ebe unu si bia;

26. mb͕e ahu ka unu gāmalite isi, Ayi riri ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru Gi, I zíkwara ihe n'amá-ayi;

27. ma Ọ gāsi, Asim unu, amataghm ebe unu si bia; puanu n'irum, ndi nile nālu ọlu ajọ omume.

28. N'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita ikekere-ezé ahu gādi, mb͕e unu gāhu Abraham, na Aisak, na Jekob, na ndi-amuma nile, n'ala-eze Chineke, ma unu onwe-unu aburu ndi achupuru n'èzí.

29. Ha gēsi kwa n'Ọwuwa-anyanwu na Ọdida-anyanwu, si kwa n'Ugwu na Ndida, bia, nọdu kwa n'ala-eze Chineke.

30. Ma le, ndi-ikpe-azu di ndi gēbu uzọ, ndi bu uzọ di kwa ndi gābu ndi-ikpe-azu.

31. N'oge hour ahu ndi-Farisi ufọdu biakutere Ya, si Ya, Pua, si n'ebe a la: n'ihi na Herod nāchọ ib͕u Gi.

32. O we si ha, Ganu, si nkita-ọhia ahu, Le, anamachupu ndi-mọ ọjọ, nāluzu kwa ọlu ime ka aru di madu ike ta na echi, n'ubọchi nke-atọ emekwam ka M'zu okè.

33. Otú ọ di, aghaghi m iga ta na echi na ubọchi so ya: n'ihi na apughi ikwe ka onye-amuma la n'iyì n'ebe nābughi Jerusalem.

Luk 13