Luk 12:45-51 Bible Nso (IGBOB)

45. Ma ọ buru na orù ahu gāsi n'obi-ya, Onye-nwem nānọ ọdù di anya ibia; ọ buru kwa na ọ gāmalite iti ndikom na ndinyom nēje ozi aka, na iri ihe-oriri na iṅu ihe-ọṅuṅu, na iṅubiga manya ókè;

46. onye-nwe orù ahu gābia n'ubọchi ọ nēleghi anya ya, na n'oge hour ọ nāmaghi, ọ gēb͕ubi kwa ya nkpirikpi abua, ke òkè nye ya n'etiti ndi nēkwesighi ka atukwasi ha obi.

47. Ọzọ, orù ahu, nke mara ihe onye-nwe-ya chọrọ, ma o dozighi, o meghi kwa dika ọ chọrọ, agāpia ya ọtutu utari;

48. ma onye nāmaghi, me kwa ihe kwesiri ihe-otiti, agāpia ya utari ole-na-ole. Ọzọ, onye ọ bula enyere ihe uku, n'aka-ya ka agāchọ kwa ihe uku: onye ha nye-kwa-ra ihe uku n'aka idebe, n'aka-ya ka ha gāju ihe nke ka.

49. Abiaram itusa ọku n'elu uwa; ma gini ka M'nāchọ, ọ buru na afunwuwo ya-ri ub͕u a?

50. Ma enwerem baptism agēji mem baptism; ọ nēb͕ukwam nb͕u n'obi nke-uku rue mb͕e agēmezu ya.

51. Ùnu nēchè na abiaram inye udo n'uwa? asim unu, É-è; kama nkewa:

Luk 12