Luk 11:6-11 Bible Nso (IGBOB)

6. n'ihi na otù eyìm esiwo n'ije biakutem, ma enweghm ihe ọ bula m'gēdebe n'iru ya;

7. ma onye ahu gēsi nime ulo za, si, Esob͕ulam: emechiwo uzọ ub͕u a, mu na umu-ntakirim nēdina kwa n'ihe-ndina-ayi; apughm ibili inye gi?

8. Asim unu, Ọ buru kwa na ọ gaghi-ebili inye ya n'ihi na ọ bu eyì-ya, ma n'ihi aririọ-ya nēnweghi ihere ọ gēbili nye ya ka ihe di ya nkpà ra.

9. Mu onwem si kwa unu, Riọnu, agēnye kwa unu, chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu.

10. N'ihi na onye ọ bula nke nāriọ nāriọta; onye nāchọ kwa nāchọta; onye nāku kwa ka agēmeghere.

11. Ma ònye n'etiti unu, bú nna, ka nwa-ya gāriọ ob͕e achicha, ọ nye ya nkume? ma-ọbu azù, ọ nye ya agwọ n'ọnọdu azù?

Luk 11