28. Ma Ya onwe-ya siri, Nke bu ezi-okwu kari bu, ngọzi nādiri ndi nuru okwu Chineke, debe kwa ya.
29. Ma mb͕e ìgwè madu nēzukọ n'ebe Ọ nọ, Ọ malitere isi, Ọb͕ọ a bu ajọ ọb͕ọ: ọ nāchọ ihe-iriba-ama; agaghi-enye kwa ya ihe-iriba-ama ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona.
30. N'ihi na dika Jona ghọrọ ndi Nineve ihe-iriba-ama, otú a ka Nwa nke madu gādi-kwa-ra ọb͕ọ a.
31. Agēme ka eze-nwanyi nke Ndida so ndikom nke ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ọ gāma kwa ha ikpé: n'ihi na o siri n'ebe uwa sọturu bia inu amam-ihe Solomom; ma le, Onye ka Solomom nọ n'ebe a.
32. Ndikom Nineve gēso ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ha gāma kwa ya ikpé: n'ihi na ha chèghariri na nkwusa nke Jona; ma le, Onye ka Jona nọ n'ebe a.
33. Ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ muyere oriọna, nādọba ya n'ebe di nzuzo, ma-ọbu n'okpuru mb͕é, kama n'elu ihe-idọba-oriọna, ka ndi nābà nime ulo we hu ìhè-ya.
34. Oriọna nke aru-gi bu anya-gi: mb͕e ọ bula anya-gi nēle otù ebe, aru-gi dum juputa-kwa-ra n'ìhè; ma mb͕e ọ bula ọ jọrọ njọ, aru-gi juputa-kwa-ra n'ọchichiri.
35. Ya mere, le anya ma ihè di nime gi abughi ọchichiri.
36. Ya mere, ọ buru na aru-gi dum ejuputa n'ìhè, ghara inwe akuku ọ bula b͕ara ọchichiri, aru ahu dum gējuputa n'ìhè, dika mb͕e oriọna, site n'ìhè-ya nēnwu, nēnye gi ìhè.
37. Ma mb͕e Ọ nēkwu okwu, onye-Farisi kpọrọ Ya ka O so ya rie nri-ututu: O we ba, nọdu na nri.
38. Ma mb͕e onye-Farisi ahu huru ihe Ọ nēme, o ju ya anya na O bughi uzọ kwo aka-Ya mb͕e Ọ gaje iri nri-ututu.