Luk 11:2-11 Bible Nso (IGBOB)

2. O we si ha, Mb͕e ọ bula unu nēkpe ekpere, sinu, Nna, Ka edo aha-Gi nsọ. Ka ala-eze-Gi bia.

3. Nēnye ayi nri kwa-ubọchi nke gēzuru ayi n'ubọchi ta.

4. B͕aghara kwa ayi nmehie nile ayi; n'ihi na ayi onwe-ayi nāb͕aghara kwa onye ọ bula nke ji ayi ugwọ. Ewebà-kwa-la ayi nime ọnwunwa.

5. O we si ha, Ònye nime unu gēnwe eyì, gējeku kwa ya n'etiti abali, si ya, Eyìm, binyem ob͕e achicha atọ;

6. n'ihi na otù eyìm esiwo n'ije biakutem, ma enweghm ihe ọ bula m'gēdebe n'iru ya;

7. ma onye ahu gēsi nime ulo za, si, Esob͕ulam: emechiwo uzọ ub͕u a, mu na umu-ntakirim nēdina kwa n'ihe-ndina-ayi; apughm ibili inye gi?

8. Asim unu, Ọ buru kwa na ọ gaghi-ebili inye ya n'ihi na ọ bu eyì-ya, ma n'ihi aririọ-ya nēnweghi ihere ọ gēbili nye ya ka ihe di ya nkpà ra.

9. Mu onwem si kwa unu, Riọnu, agēnye kwa unu, chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu.

10. N'ihi na onye ọ bula nke nāriọ nāriọta; onye nāchọ kwa nāchọta; onye nāku kwa ka agēmeghere.

11. Ma ònye n'etiti unu, bú nna, ka nwa-ya gāriọ ob͕e achicha, ọ nye ya nkume? ma-ọbu azù, ọ nye ya agwọ n'ọnọdu azù?

Luk 11