16. Ndi ọzọ nāchọ ihe-iriba-ama n'aka-Ya site n'elu-igwe, n'ihi na ha nānwa Ya.
17. Ma ebe Ya onwe-ya matara èchìchè-uche nile ha, Ọ si ha, Ala-eze ọ̀ bula nke kewara megide onwe-ya, anēme ya ka ọ tọb͕ọrọ n'efu; ulo nke kewakwara megide ulo nāda.
18. Ma ọ buru kwa na Setan kewara megide onwe-ya, àla-eze-ya gēsi aṅa guzo? n'ihi na unu nāsi na anamachupu ndi-mọ ọjọ n'ike Beelzebul.
19. Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike Beelzebul, n'ike onye ka umu-unu ndikom nāchupu ha? n'ihi nka ha gābu ndi-ikpé-unu.
20. Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike nkpisi-aka Chineke, ya mere ala-eze Chineke ruru unu aru.
21. Mb͕e ọ bula onye di ike nke kezuru ihe-agha-ya nēche obí nke aka ya, ihe o nwere adi n'udo:
22. ma mb͕e ọ bula onye ka ya ike gābia imegide ya, meri kwa ya, ọ nara ya ihe-agha-ya dum nke ọ tukwasiriri obi-ya, keri kwa ihe ọ nara ya.
23. Onye nādighi n'akukum nēmegidem; onye nādighi-esokwam ikpokọta ihe nāchusa achusa.
24. Mb͕e ọ bula mọ nādighi ọcha siri n'aru madu pua, ọ nāgabiga n'ebe miri nādighi nāchọ izu-ike: ma ebe ọ dighi-achọta ya, ọ si, M'gālaghachi n'ulom ebe m'siri puta.
25. Mb͕e ọ biara, o we hu ya ka azachasiri ya dozisia ya.
26. Mb͕e ahu ọ ga, chiri mọ-ibe-ya asa nke jọkari ya onwe-ya njọ tiyere onwe-ya; ha we ba biri n'ebe ahu: ọnọdu ikpe-azu nke madu ahu bia jọkari nke-mbu.
27. O we rue, mb͕e Ọ nēkwu okwu ndia, na otù nwanyi si n'etiti ìgwè madu ahu weli olu-ya, si Ya, Ngọzi nādiri afọ nke buru Gi, na ara nke I miri.
28. Ma Ya onwe-ya siri, Nke bu ezi-okwu kari bu, ngọzi nādiri ndi nuru okwu Chineke, debe kwa ya.