Luk 10:8-18 Bible Nso (IGBOB)

8. Nime obodo ọ bula unu gābà kwa, ha we nara unu nke-ọma, rienu ihe edebere n'iru unu:

9. mekwanu ndi aru-ha nādighi ike nọ n'ebe ahu ka aru-ha di ike, si-kwa-nu ha, Ala-eze Chineke di unu nso.

10. Ma nime obodo ọ bula unu gābà, ma ha anaraghi unu nke-ọma, puanu n'amá-ya, si,

11. Ọbuná ájá si n'obodo-unu, nke rakuru n'ukwu-ayi, ka ayi nēhichapu imegide unu: otú ọ di, maranu nka, na ala-eze Chineke di nso.

12. Asim unu, Ala Sọdọm gānagide okwu n'ubọchi ahu kari obodo ahu.

13. Ahuhu gādiri gi, Korazin; ahuhu gādiri gi, Betsaida; n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Taia na Saidon, nke aluru nime unu, ha gēchèghariwori n'oge di anya gara aga, nānọdu n'ákwà-nkpe na ntu.

14. Otú ọ di, Taia na Saidon gānagide okwu n'ikpé ahu kari unu.

15. Gi onwe-gi kwa, Kapanaum, àgēweli gi rue elu-igwe? agēweda gi rue Hedis.

16. Onye nānu okwu-unu nānu okwu Mu onwem; onye nāju kwa unu nāju Mu onwem; ma onye nāju Mu onwem nāju Onye ziterem.

17. Ọgu ndikom atọ na iri ahu were ọṅù lata, si, Onye-nwe-ayi, ọbuná ndi-mọ ọjọ ka anēdo n'okpuru ayi n'aha-Gi.

18. O we si ha, Ahurum Setan ka ọ darari dika àmùmà pua n'elu-igwe.

Luk 10