Luk 10:5-7 Bible Nso (IGBOB)

5. Ma ulo ọ bula unu gābà nime ya, burunu uzọ si, Udo diri ulo a.

6. Ọ buru kwa na onye-udo nọ n'ebe ahu, udo-unu gānọkwasi ya: ma ọ buru na onye-udo anọghi ya, udo-unu gālaghachiri unu ọzọ.

7. Nọgide-kwa-nu n'ulo ahu, nēri nāṅu kwa ihe ha nēnye umu: n'ihi na onye-ọlu kwesiri ugwọ-ọlu-ya. Unu esila n'otù ulo ba n'ulo ọzọ.

Luk 10