Luk 1:9-18 Bible Nso (IGBOB)

9. dika omume ọlu nchu-àjà nādi, ọlu ibà n'ulo nsọ nke Onye-nwe-ayi na isure ihe-nsure-ọku nēsì isì utọ ruru ya site n'ife nzà.

10. Ọra ndi-Ju nile nēkpe kwa ekpere n'èzí n'oge hour isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

11. Ewe me ka ọ hu mọ-ozi Onye-nwe-ayi ka o guzoro n'aka-nri ebe-ichu-àjà ebe a na-eme ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

12. Mb͕e Zakaraias huru ya obi we lọ ya miri, ọ tu-kwa-ra egwu.

13. Ma mọ-ozi ahu siri ya, Atula egwu, Zakaraias: n'ihi na a nuwo aririọ-gi, nwunye-gi Elizabet gāmu-kwa-ra gi nwa-nwoke, i gākpọ kwa aha-ya Jọn.

14. I gēnwe kwa ọṅù na obi-utọ; ọtutu madu gāṅuri kwa ọṅu n'ọmumu-ya.

15. N'ihi na ọ gābu onye uku n'anya Onye-nwe-ayi, ọ gaghi-aṅu kwa manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ma-ọli; agēme kwa ka o juputa na Mọ Nsọ, ọbuná site n'afọ nne-ya.

16. Ọtutu madu nime umu Israel ka ọ gēme kwa ka ha chigharikwute Onye-nwe-ayi Chineke-ha.

17. Ya onwe-ya gāga kwa n'iru Ya nime mọ na ike Elaija, ime ka obi ndi bu nna chigharikute umu-ha, ime kwa ka ndi nānughi ihe chigharia iga n'uche ndi ezi omume; idozi nye Onye-nwe-ya otù ndi nke akwadebeworo Ya.

18. Zakaraias we si mọ-ozi ahu, Òle ihe m'gēji mara nka? n'ihi na mu onwem bu agadi, nwunyem aghọwo kwa agadi.

Luk 1