Luk 1:67-80 Bible Nso (IGBOB)

67. Nna-ya Zakaraias we juputa na Mọ Nsọ, o we bu amuma, si,

68. Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye-nwe-ayi, Chineke nke Israel;N'ihi na O letawo ndi-Ya, lu-kwa-ra ha ọlu nb͕aputa,

69. O weliwo-kwa-ra ayi mpi nke nzọputaN'ulo onye nējere Ya ozi, bú Devid

70. (Dika O kwuru site n'ọnu ndi-amuma-Ya di nsọ site n'oge mbu),

71. Nzọputa n'aka ndi-iro-ayi, na n'aka ndi nile nākpọ ayi asì;

72. Imere nna-ayi-hà ebere,Na icheta ọb͕ub͕a-ndu nsọ Ya;

73. Iyí Ọ ṅuru Abraham nna-ayi,

74. Ikweye ayi, ebe adọputaworo ayi n'aka ndi-iro-ayi,Ka ayi nēkpere Ya nātughi egwu.

75. N'obi ọcha na ezi omume n'iru Ya ubọchi-ayi nile.

76. Ọzọ kwa, gi onwe-gi, nwatakiri, agākpọ gi onye-amuma nke Onye kachasi ihe nile elu:N'ihi na i gāga n'iru Onye-nwe-ayi idozi uzọ-Ya nile;

77. Ime ndi nke Ya ka ha mara nzọputaNime nb͕aghara nmehie nile ha,

78. N'ihi obi ebere nke Chineke-ayi,Nke ọwuwa-anyanwu nke sitere n'elu gēleta ayi nime ya,

79. Imukwasi ndi nọ n'ọchichiri na onyinyo ọnwu ìhè;Iduzi ukwu-ayi ba n'uzo udo.

80. Nwatakiri ahu we nētọ, nēsi kwa ike na mọ-ya, o we nọ n'ọhia rue ubọchi ewere ya gosi Israel.

Luk 1