Luk 1:62-76 Bible Nso (IGBOB)

62. Ha we fere nna-ya aka, ihe ọ chọrọ ka akpọ ya.

63. O we riọ ha ka ha nye ya ihe eji ede akwukwọ, o we de, si, Aha-ya bu Jọn. O we ju ha nile anya.

64. Ngwa ngwa ọnu-ya we saghe, ire-ya tọpu kwa, o we nēkwu okwu, nāgọzi Chineke.

65. Ndi nile bi ha gburugburu we tua egwu: ewe kwusa okwu ndia nile n'elu-ala Judia dum.

66. Ndi nile nke nuru ha we debe ha n'obi-ha, si, Àha madu gini kwa ka nwatakiri a gābu? N'ihi na aka Onye-nwe-ayi diyere ya.

67. Nna-ya Zakaraias we juputa na Mọ Nsọ, o we bu amuma, si,

68. Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye-nwe-ayi, Chineke nke Israel;N'ihi na O letawo ndi-Ya, lu-kwa-ra ha ọlu nb͕aputa,

69. O weliwo-kwa-ra ayi mpi nke nzọputaN'ulo onye nējere Ya ozi, bú Devid

70. (Dika O kwuru site n'ọnu ndi-amuma-Ya di nsọ site n'oge mbu),

71. Nzọputa n'aka ndi-iro-ayi, na n'aka ndi nile nākpọ ayi asì;

72. Imere nna-ayi-hà ebere,Na icheta ọb͕ub͕a-ndu nsọ Ya;

73. Iyí Ọ ṅuru Abraham nna-ayi,

74. Ikweye ayi, ebe adọputaworo ayi n'aka ndi-iro-ayi,Ka ayi nēkpere Ya nātughi egwu.

75. N'obi ọcha na ezi omume n'iru Ya ubọchi-ayi nile.

76. Ọzọ kwa, gi onwe-gi, nwatakiri, agākpọ gi onye-amuma nke Onye kachasi ihe nile elu:N'ihi na i gāga n'iru Onye-nwe-ayi idozi uzọ-Ya nile;

Luk 1