Luk 1:59-61 Bible Nso (IGBOB)

59. O we rue n'ubọchi nke-asato, na ha biara ibi nwatakiri ahu úgwù; ha we kpọbá ya Zakaraias, n'aha nna-ya.

60. Nne-ya we za, si, mba; kama agākpọ ya Jọn.

61. Ha we si ya, Ọ dighi onye ọ bula n'etiti ndi-ikwu-gi nke anākpọ aha nka.

Luk 1