Luk 1:5-16 Bible Nso (IGBOB)

5. N'ubọchi Herod, eze Judia, otù onye-nchu-àjà di, aha-ya bu Zakaraias, nke si n'òtù obodo Abaija puta: o nwe-kwa-ra nwunye nke si n'etiti umu-nwanyi Eron puta; aha nwayi ahu bu Elizabet.

6. Ha abua bu ndi ezi omume n'iru Chineke, nāga n'ihe nile Onye-nwe-ayi nyere n'iwu na n'ihe nile Ọ guru n'ihe ziri ezi nādighi ita uta.

7. Ha ejighi kwa nwa, n'ihi na Elizabet bu nwanyi-àgà, ha abua aghọwo kwa agadi.

8. Ma o rue, mb͕e ọ nālu ọlu nchu-àjà n'iru Chineke dika ha si-eme kwa ubochi,

9. dika omume ọlu nchu-àjà nādi, ọlu ibà n'ulo nsọ nke Onye-nwe-ayi na isure ihe-nsure-ọku nēsì isì utọ ruru ya site n'ife nzà.

10. Ọra ndi-Ju nile nēkpe kwa ekpere n'èzí n'oge hour isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

11. Ewe me ka ọ hu mọ-ozi Onye-nwe-ayi ka o guzoro n'aka-nri ebe-ichu-àjà ebe a na-eme ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

12. Mb͕e Zakaraias huru ya obi we lọ ya miri, ọ tu-kwa-ra egwu.

13. Ma mọ-ozi ahu siri ya, Atula egwu, Zakaraias: n'ihi na a nuwo aririọ-gi, nwunye-gi Elizabet gāmu-kwa-ra gi nwa-nwoke, i gākpọ kwa aha-ya Jọn.

14. I gēnwe kwa ọṅù na obi-utọ; ọtutu madu gāṅuri kwa ọṅu n'ọmumu-ya.

15. N'ihi na ọ gābu onye uku n'anya Onye-nwe-ayi, ọ gaghi-aṅu kwa manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ma-ọli; agēme kwa ka o juputa na Mọ Nsọ, ọbuná site n'afọ nne-ya.

16. Ọtutu madu nime umu Israel ka ọ gēme kwa ka ha chigharikwute Onye-nwe-ayi Chineke-ha.

Luk 1