Luk 1:47-59 Bible Nso (IGBOB)

47. Ọ nātọ kwa mọm utò nke-uku na Chineke, bú Onye-nzọputam.

48. N'ihi na O lere ọnọdu di ala nke orù-Ya nwanyi anya:N'ihi na le, site n'ub͕u a ọb͕ọ nile gākpọm onye ngọzi diri.

49. N'ihi na Onye di ike emewom ihe uku di iche iche;Aha-Ya di kwa nsọ.

50. Ebere-Ya di-kwa-ra ndi nātu egwu YaRue ọb͕ọ na ọb͕ọ.

51. O werewo ogwe-aka-Ya gosi ike;Ọ chusawo ndi-npako n'èchìchè nke obi-ha.

52. O wedawo ndi di ike pua n'oche-eze-ha,Weli kwa elu ndi ọnọdu-ha di ala.

53. O werewo ezi ihe nile nyeju ndi agu nāgu afọ;Zipu kwa ndi-ọgaranya n'aka efu.

54. O nyeworo Israel nwa-Ya aka,Ka O we cheta ebere

55. (Dika Ọ gwara nna-ayi-hà)N'ebe Abraham na nkpuru-ya nọ rue mb͕e ebighi-ebi.

56. Meri we nọyere ya ihe dika ọnwa atọ, we laghachi n'ulo-ya.

57. Ma oge Elizabet zuru ka ọ gāmuta nwa; o we mua nwa-nwoke.

58. Ndi-ab͕ata-obi-ya na ndi-ikwu-ya we nu na Onye-nwe-ayi mere ka ebere-Ya di uku n'ebe ọ nọ; ha we so ya ṅuri ọṅu.

59. O we rue n'ubọchi nke-asato, na ha biara ibi nwatakiri ahu úgwù; ha we kpọbá ya Zakaraias, n'aha nna-ya.

Luk 1