40. we ba n'ulo Zakaraias, kele kwa Elizabet.
41. O we rue, mb͕e Elizabet nuru ekele Meri, nwa-ya wuliri n'afọ-ya; Elizabet we juputa na Mọ Nsọ;
42. o we welie olu-ya tisie nkpu ike, si, Gi onwe-gi bu onye agọziri agọzi n'etiti ndinyom, ọ bu kwa onye agọziri agọzi ka nkpuru nke afọ-gi di.
43. Òle ebe ka nka si kwa rum, na nne Onye-nwem gābiakutem?
44. N'ihi na lee, mb͕e olu ekele-gi ruru na ntim, nwam wuliri n'afọm n'obi-utọ.
45. Ngọzi nādi-kwa-ra nwanyi ahu nke kwere na ihe ndia gēmezu, bú nke agwaworo ya site n'ọnu Onye-nwe-ayi.
46. Meri we si,Nkpuru-obim nēme ka Onye-nwe-ayi di uku,
47. Ọ nātọ kwa mọm utò nke-uku na Chineke, bú Onye-nzọputam.
48. N'ihi na O lere ọnọdu di ala nke orù-Ya nwanyi anya:N'ihi na le, site n'ub͕u a ọb͕ọ nile gākpọm onye ngọzi diri.
49. N'ihi na Onye di ike emewom ihe uku di iche iche;Aha-Ya di kwa nsọ.
50. Ebere-Ya di-kwa-ra ndi nātu egwu YaRue ọb͕ọ na ọb͕ọ.
51. O werewo ogwe-aka-Ya gosi ike;Ọ chusawo ndi-npako n'èchìchè nke obi-ha.
52. O wedawo ndi di ike pua n'oche-eze-ha,Weli kwa elu ndi ọnọdu-ha di ala.
53. O werewo ezi ihe nile nyeju ndi agu nāgu afọ;Zipu kwa ndi-ọgaranya n'aka efu.
54. O nyeworo Israel nwa-Ya aka,Ka O we cheta ebere
55. (Dika Ọ gwara nna-ayi-hà)N'ebe Abraham na nkpuru-ya nọ rue mb͕e ebighi-ebi.