24. Ma mb͕e ubọchi ndia gasiri Elizabet nwunye-ya turu ime; o we zobe onwe-ya ọnwa ise, si,
25. Otú a ka Onye-nwe-ayi meworo nyem n'ubochi O ji lem anya, iwepu ita-utam n'etiti madu.
26. Ma n'ọnwa nke isi ezigara mọ-ozi ahu, bú Gebriel, site n'ebe Chineke nọ je obodo nke Galili, anākpọ aha-ya Nazaret,
27. jekuru nwa-ab͕ọghọ nā-maghi nwoke, onye ekwere na otù nwoke si n'ulo Devid puta, onye aha-ya bu Josef, gālu ya; aha nwa-ab͕ọghọ ahu bu Meri.
28. O we bata n'ebe ọ nọ, si, Ekele, gi onye Chineke meworo ka i nara amara, Onye-nwe-ayi nọyere gi.
29. Ma obi lọrọ ya miri nke-uku n'okwu-ya, o we nātule n'uche-ya aha ekele okwu a gābu.
30. Mọ-ozi ahu we si ya, Atula egwu, Meri: n'ihi na Chineke mere gi amara.
31. Le kwa, i gāturu ime, muta Nwa-nwoke, kpọ aha-Ya Jisus.
32. Nwa-nwoke ahu gābu onye uku, agākpọ kwa Ya Ọkpara nke Onye kachasi ihe nile elu: Onye-nwe-ayi Chineke gēnye kwa Ya oche-eze nna-Ya Devid:
33. Ọ gābu kwa eze ulo Jekob rue mb͕e ebighi-ebi; ala-eze-Ya agaghi-agwu kwa agwu.
34. Meri we si mọ-ozi ahu, Ìhe a gēsi aṅa me, ebe ọ dighi nwoke m'mara?
35. Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mọ Nsọ gābiakwasi gi, ike nke Onye kachasi ihe nile elu gēkpuchi kwa gi: n'ihi nka Ihe di nsọ nke i di ime Ya, agākpọ Ya Ọkpara Chineke.