3. ma-ọbu mb͕e ọ gēmetu ihe ruru árú nke madu, ọbuná ihe ọ bula nke ya ruru árú nke eji meru ya, ma ezonariri ya ya; mb͕e ya onwe-ya mara, ikpe gāma kwa ya:
4. ma-ọbu mb͕e madu gāṅu iyi, nēwere eb͕ub͕ere-ọnu-ya kwu okwu efu ime ihe ọjọ, ma-ọbu ime ezi ihe, ọbuná okwu efu ọ bula madu nēkwu n'iṅu iyi, ma ezonariri ya; mb͕e ya onwe-ya mara, ikpe gāma kwa ya bayere otù nime ihe ndia:
5. o gēru kwa, mb͕e ikpe mara ya bayere otù nime ihe ndia, na o gēkwuputa ihe ahu nke ọ mehieworo nmehie bayere ya:
6. ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya bayere nmehie-ya nke ọ mehieworo, bú nne nke si n'ìgwè ewu na aturu puta, nwa-aturu ma-ọbu nwa-ewu, ka ọ buru àjà-nmehie; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu.
7. Ma ọ buru na aka-ya erughi ihe gēzù nwa-aturu, o gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya bayere nmehie nke ọ mehieworo, bú nduru abua ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua; otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku.
8. Ọ gāchitara ha onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gēburu uzọ weta nso nke diri àjà-nmehie, ọ gātubipu isi-ya site n'olu-ya, ma ọ gaghi-ekewa ya.
9. Ọ gēfesa ufọdu nime ọbara àjà-nmehie ahu n'elu akuku ebe-ichu-àjà; ma nke fọduru nime ọbara ka agāgbasa na ntọ-ala ebe-ichu-aja: àjà-nmehie ka ọ bu.
10. Ọ gēme nke-abua ka ọ buru àjà-nsure-ọku dika ikpé ahu si di: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu nke ọ mehieworo, agāb͕aghara kwa ya ya.
11. Ma ọ buru na aka-ya erughi na nduru abua ma-ọbu n'umu-kpalakwu-kwu abua, ọ gēweta kwa onyinye-ya iji biaru nso, bayere nmehie nke ọ mehie-woro, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ka ọ buru àjà-nmehie; ọ gaghi-atukwasi ya manu, ọ gaghi-etiye kwa frankincense n'elu ya: n'ihi na àjà-nmehie ka ọ bu.