Levitikọs 27:13-15 Bible Nso (IGBOB)

13. Ma ọ buru na ọ gāb͕aputa ya n'ezie, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzọ ise ya n'ọ̀rùrù-ọnu-gi.

14. Ọzọ, mb͕e onye ọ bula gēdo ulo-ya nsọ idiri Jehova nsọ, onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu, ma ọ bu ezi ulo ma-ọbu ulo ọjọ: dika onye-nchu-àjà gārù ya ọnu, otú a ka o gēguzo.

15. Ọ buru kwa na onye ahu nke nēdo ya nsọ ab͕aputa ulo-ya, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzọ ise nke ego ọ̀rùrù-ọnu-gi, ọ gābu kwa nke ya.

Levitikọs 27