Levitikọs 26:8-11 Bible Nso (IGBOB)

8. Madu ise n'etiti unu gāchu ọgu madu ise, ọgu madu ise n'etiti unu gāchu kwa orú nnù madu na nnù madu ise: ndi-iro-unu gāda kwa n'iru unu site na mma-agha.

9. M'gēche unu iru, me kwa ka unu mua ọmùmù, me kwa ka unu ba uba: M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosie ike n'ebe unu nọ.

10. Unu gēri ihe ochie nke anēdebe site na mb͕e ochie, unu gēweputa kwa nke-ochie n'iru nke-ọhu.

11. M'gētiye ebe-obibim n'etiti unu: nkpuru-obim agaghi-asọ kwa unu oyi.

Levitikọs 26