10. Unu gēri ihe ochie nke anēdebe site na mb͕e ochie, unu gēweputa kwa nke-ochie n'iru nke-ọhu.
11. M'gētiye ebe-obibim n'etiti unu: nkpuru-obim agaghi-asọ kwa unu oyi.
12. M'ganējeghari n'etiti unu, M'gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi.
13. Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt, si kwa n'iburu ha ndi-orù, puta; M'tijiwo kwa nkpọrọ nile nke yoke-unu, me kwa ka unu je ije iguzo-ọtọ.
14. Ma ọ buru na unu egeghm nti, unu ewe ghara ime ihe nile ndia M'nyere n'iwu;