Levitikọs 25:49-52 Bible Nso (IGBOB)

49. ma-ọbu nwa-nne nna-ya, ma-ọbu nwa nwa-nne nna-ya, gāb͕aputa ya; ma-ọbu onye-aru-ya site n'ab͕uru-ya gab͕aputa ya; ma ọ buru na aka-ya erue inwe àkù, ọ gāb͕aputa onwe-ya.

50. Ya na onye b͕aworo ya gāgu kwa site n'aro ọ were onwe-ya renye ya rue arọ jubile: ego orire-ya gādi kwa ka ọnu-ọgugu arọ; dika ubọchi nile nke onye egoro ọlu ka ọ gānọ n'aka-ya.

51. Ọ buru na ọtutu arọ fọduru, dika ha si di ka ọ gēsite n'ego orire-ya nyeghachi ihe-nb͕aputa-ya.

52. Ma ọ buru na ole-na-ole fọduru n'arọ rue arọ jubile, ọ gāgu-kwa-ra ya; dika arọ-ya nile si di ka ọ gēnyeghachi ihe-nb͕aputa-ya.

Levitikọs 25