Levitikọs 25:48-50 Bible Nso (IGBOB)

48. mb͕e eresiri ya, nb͕aputa diri ya; otù onye nke sitere n'umu-nne-ya gāb͕aputa ya:

49. ma-ọbu nwa-nne nna-ya, ma-ọbu nwa nwa-nne nna-ya, gāb͕aputa ya; ma-ọbu onye-aru-ya site n'ab͕uru-ya gab͕aputa ya; ma ọ buru na aka-ya erue inwe àkù, ọ gāb͕aputa onwe-ya.

50. Ya na onye b͕aworo ya gāgu kwa site n'aro ọ were onwe-ya renye ya rue arọ jubile: ego orire-ya gādi kwa ka ọnu-ọgugu arọ; dika ubọchi nile nke onye egoro ọlu ka ọ gānọ n'aka-ya.

Levitikọs 25