47. Ọzọ, mb͕e aka ọbìa ma-ọbu onye-nnọdu n'ala-unu gēru inwe àkù, ma nwa-nne-gi adawo ob͕eye n'akuku-ya, were onwe-ya renye ọbìa ma-ọbu onye-nnọdu n'ala-gi, ma-ọbu were onwe-ya renye onye bayere nkpọrọgwu n'ab͕uru ọbìa:
48. mb͕e eresiri ya, nb͕aputa diri ya; otù onye nke sitere n'umu-nne-ya gāb͕aputa ya:
49. ma-ọbu nwa-nne nna-ya, ma-ọbu nwa nwa-nne nna-ya, gāb͕aputa ya; ma-ọbu onye-aru-ya site n'ab͕uru-ya gab͕aputa ya; ma ọ buru na aka-ya erue inwe àkù, ọ gāb͕aputa onwe-ya.